Header Ads

Breaking News

Iru uju, ka Bishop Odili doro Aja mass n' Ozubulu

Taa bụ abali nke anọ n’ọnwa Septemba 2017, ka Bishop; Most Rev. Hilary Paul Odili Okeke dooro mmadụ iri na atọ, ndị nwụrụ na njinji jiri n’ụbọchị ụka ọgọstu 6, 2017, n’ ụlọụka Katọlik St. Phillips, nke dị n’Amakwa Ọzụbụlụ, Anambra Steeti, mass.
                         
Ọtụtụ ndị ọ nọ n’ụlọ mara ihe zụrụ n’ahịa gbasara ozi na Fraiday sị na akwaala ndị a ihe mberede a naara ndụ ha n’ike, mana otu abụghị n’ezi.
Onye ntaakụkọ anyi na mazinwosu blog.com bụ Mazi Ifeanyi Nwosu, mere ka a mata na ọ bụ taa bụ Mọnde Septemba 4, 2017 ka a kaara ha ụka akwamoozu na St. Phillips, ebe ọnwụ nọrọ zute ha.

Otu onye na ndi biara, mere ka a mata nand gmenti Naijiria na-eme ihe niile ha nwere ike ime, iji jide ndị kụrụ ome a, ma taa ha ahh kwesrị ha dka ha kwere na nkwa.

Ka a na-agba ya ajụjụ ọnụ, Nna anyị n’ime Chineke bụ Most Rev. Hilary Paul Odili Okeke, kasiri ndị ọnwụ a metụtara obi, ma gbakwaa ndị mmadụ ume.  Ọ sịrị ka onye ọbụla ghara ịda mba n’ikpere Chukwu, ma hapụrụ Chukwu ọbọ, n’ihi na ọ bụ ya nwe ịbọ ọbọ.
Dịka onye ntaakụkọ anyị siri chọpụta, a ga-eli ụfọdụ ndịa nwụrụ n’ime ụlọụka, ma burukwa ụfọdụ ga lie na be ha dị iche iche.


Ka mkpụrụ obi ha, na mkpụrụ obi ndị niile nwụrụ anwụ, zuru ike na ndokwa…. Amịn

No comments