A hapula ochu nta akuko Kaduna no n'uloikpe
Ndị ụlọ ikpe Magistrate dị na Kaduna gbasara ikpe eyinyere megide ọchụ nta akụkọ nọ na Kaduna aha ya bụ Midat Joseph. Onyeisi ndị uweoji na Kaduna kpọchiri nwoke a abalị abụọ maka okwu ọ sara ya na Whatsapp. O mechhara hapụ ya ka a bịara gbapụta ya. A kpụgara onye nta akụkọ a ụlọikpe maka ikpa nkata ọjọọ, inye nsogbu na ikwu okwu asị megide onye kpụpụtara ya ụlọ ikpe. Ka osila di, ahụghị ọkaikpe enyefere okwu a n’aka ụbọchị mbụ na abụọ e yinyere ikpe a.
Ndị nnọchite anya Joseph gbara mbọ hụ na agbasara ihe gbasara ikpe a n’ihi na ndị kanyere ya bụ ikpe abiaghị ụlọikpe ka akanyere ya, nke megidere iwu na-ahụ maka ụlọikpe na Kaduna.

No comments