Header Ads

Breaking News

Asịghị m na a ga-amachi onyoonyo egwu Naijiria niile e mere na obodo ọzọ abụghị Naijiria; lee ihe m kwuru…. Lai Mohammed

Onye Minista na-ahụ  maka omenaala na mgbasa ozi, Alhaji Lai Mohammed chetaara  ndị mmadụ  ihe gọọmentị Naijira kwuru, na ihe nkiri ọbụla a na-emere ndị Naijiria bụ  na Naijiria ebe a ka a ga-anọ mepụta ya. Ọ sịrị na ihe mere e ji mee ya Minista abụghị ka a na-eburu ego na Naijiria were gaa na-akwalite mba ndị ọzọ.
N’okwu o kwuru na Lagos, ọ sịrị na agaghị akwalite ụlọọrụ  ebe a na-emepụta ihe nkiri na Naijiria site n’ iburu ọrụ  ha kwesịrị ịrụ  na Naijiria bugara ndị obodo ọzọ.
“Asịghị m na bido taa, na aga na-arụ  egwu na ihe nkiri niile na Naijira, ma ọ bụ kwanụ  na a ga-amachi ịrụpụta egwu na ihe nkiri niile n’ala ọzọ. Ihe m kwuru bụ  na, ọ bụrụ  na a ga-akpọ egwu ọbụla ma ọ bụ  ihe nkiri ọbụla nke Naijiria, na a ga-eyibegharị iwu ga-ekwu ka a na-arụpụta ihe dị otu a na Naijiria; nke a ka m kwuru, ila azụ  adịghị ya.”
O chetaara ndị mmadụ ka ndị Naijiria o metụtara si were na-akpọ ya esepụ ghị aka oge e mepụtara  ihe ngosi “Big Brother Naija” na South Africa. Ọ sịrị na o zipụrụ  ndị otu NBC (National Broadcasting Commission) ka ha nyochaa ihe kpatara nke ahụ .
“Mgbe anyị chọpụtara ihe kpatara ya, anyi sị ka anyị hazigharịa iwu ụfọdụ  ndị NBC ji arụ ọrụ  ka ụdịrị ihe dị otu ahụ  ghara ime oge ọzọ.”
“Ọ bụ na ịhazigharị iwu ahụ ka anyị nọ, ka onye ọbụla chọrọ imere ndị Naijiria ihe nkiri ọbụla ghara ime ya karia n’ime Naijiria, maka na anyị agaghị anabatazi ka e mee ihe nkiri dị otu a n’ebe ọzọ abụghị Naijiria.

“Anyị niile bụ ndị Naijiria bụ ndị nwere ugwu ma na-agbakwa mbọ, ama m na onweghi onye Naijiria ga-akwado ka e buru ọrụ ụmụ nne anyị nọ n’ime Naịjiria a nwere ike ịrụ , bugara ndị mba ọzọ.”

No comments