Ebe ndi mmadu anoghi bu ebe ndi omekome na-anokari- ASP Cole
Ndị uweoji nọ na Lagos adọọla ndị bi na Lagos aka na ntị, ka ha zeere ebe ndị mmadụ anọghị, na ebe ndị nwere ka ọ dị n’ihi na ọ bụ ụdị ebe ahụ k andị omekome na-anọcha iji nweta ndị ha na-achọ. Nke a bụ n’ ihi ọnụọgụgụ mpụ na ịkwafu ọbara ndị ọjọọ na-emezi ugbua na Lagosna-abawanye n’ike n’ike. ASP Olarinde Famous-Cole kwuru nke a oge ndị ọjọọ gbufuru ezinaụlọ dị mmadụ anọ n’Ibeshe, dị n’ Ikorodu na ngwụcha izuụka a.
ASP mere ka amata na mmadụ atọ nwụrụ n’ebe ahụ ihe ahụ nọrọ mee, ebe onye nke ọzọ nwụrụ n’ụlọọgwụ. O kwuru na ọ bụ ezinaụlọ dị mmadụ ise ka onye mere ihe a chọrọ igbu, mana otu onye ka dị ndụ na-anara ọgwụ.
Ayọọla ndị mmadụ ka ha mụrụ any aka azụ, ma gbaa mbọ na-anọ ebe ndị mmadụ nọgasị.

No comments