Igbo Riddles- Gwa m Gwa m Gwa m Igbo
IGBO RIDDLES- GWA M GWA M GWA M IGBO
1. Igbo Riddle - Gwa m ihe kuru mmiri rịa elu.
o Answer - Akụ bekee (coconut)
2. Igbo Riddle - Gwa m ihe sịrị eze rachaa ntụ
o Answer - Ube (Pear).
3. Igbo Riddle - Gwa m kporokpotoo n'obi ọgaranya
o Answer - Ọgbiịrị ehi.
4. Igbo Riddle - Gwa m kporokpotoo na be ogbenye
o Answer - Ọgbịrị atụrụ
5. Igbo Riddle - Gwa m tụpuo ala hụ mmụọ
o Answer - Ọdụ ji
6. Igbo Riddle - Gwa m ihe a nụrụ ka ọ dara ma a nụghi ka e gburu
o Answer - Ogbe ụkwa (African Breadfruit)
7. Igbo Riddle - Gwa m ihe nọ n'ezi be nne gị eche gị mgba
o Answer - Apịtị
8. Igbo Riddle - Gwa m nwa agbọghọ ara anọ
o Answer - Ikwe (odo)
9. Igbo Riddle - Gwa m oti nwata n'anya nne ya
o Answer - Agụụ
10. Igbo Riddle - Gwa m nwanyị nọdụrụ okwu
o Answer - Oche ọkpọga
11. Igbo Riddle - Gwa m nwoke gba aka wụọ ng̔i;ge
o Answer - Imi (e zịpụrụ ezipụ)
12. Igbo Riddle - Gwa m ihe gị na ya soro baa n'ọhịa, o buru gị ụzọ pụta
o Answer - Ntụ
13. Igbo Riddle - Gwa m ihe nọ n'azụ ụlọ nne gị na-agbọ gị taa
o Answer - Ụkpaka/Ugba
14. Igbo Riddle - Gwa m ihe nọ n'elu ụlọ nne gị na-agọrọ gị ọfọ
o Answer - Ngwere (lizard)
15. Igbo Riddle - Gwa m otu ibe ji zuru ụwa ọnụ
o Answer - Ọnwa
16. Igbo Riddle - Gwa m nwa okoro ọcha gbara aka rịa ọjị
o Answer - Ido
17. Igbo Riddle - Gwa m ihe ji nganga akwụ aja
o Answer - Ukukorobụba
18. Igbo Riddle - Gwa m ọdara ọbụ ereghi ure
o Answer - Nkume
19. Igbo Riddle - Gwa m nwanyị ọgbọrọdọ ara
o Answer - Ụkpaka
20. Igbo Riddle - Gwa m ihe otu onye nwe ma ọha enwere olu akwa ya
o Answer - Oke ọkpa
Zaara onwe gị ndị a ma ọ bụrụ na ị bụ nwaafọ Naịjiria
Gwa m gwa m gwa m
1. Gwa m ndị na-ahụ ọka naanị otu ugboro n’afọ anọ….
2. Gwa m onyeisiala nọ obodo ọzọ achị obodo ya
Kwuo ihe ndị ichere bụ azịzịa ha
No comments