Ihe egwu!!! Ndi Badoo ọzọkwa- nwaanyị dị ime na di ya alaala mmụọ
Ndị a na-enyo enyo na ha nwere ike ịbụ ndị otu ogbu ara ọbara a kpọrọ Badoo, gburu ọyị abụọ(nwoke na nwaanyi) n’isi ụtụtụ taa bụ Julaị 21 ebe ha bi na steeti Ogun.
Arụ a mere n’ụlọ elu dị na striiti Hassan Abiodun, ma a gafee Ojodu Begger obere, nke dị n’okpuru ochịchị Ifo Lokal Gọọmentị, n’Ogun.
Ndị uweojii si na divishọn Ojodu Abiodun bugara ozu ha na nnukwu ụlọọgwụ dị na Sagamu.
Otu onye agbataobi ha mere ka a mata na a ga-ejikọ mmadụ abụọ ahụ ọnụ dịka di na nwunye na Disemba, tinyere na nke nwaanyị dị ime.
Onye agbataobi ọzọ sịrị na ndị omekome ahụ si na net were banye.
Onye agbataobi ọzọ sịrị na ọ bụ n’ụtụtụ ka achọpụtara na ihe mere ebe ahụ.

No comments