Header Ads

Breaking News

Ihe Mberede okporouzo alaa Mmadu 18 n'iyi- Jigawa

Ihe karịrị ọnụ ọgụgụ mmadụ iri na asatọ  (18) ka ọ nwụ naara mkpụrụ obi ha n’ihe mberede okporoụzọ . Ihe mberede a mere n’etiti ụgbọ ala J5 na Tipa n’okporoụzọ  Gumel-Gugunju dị n’okpuru ọ chịchị Gumel, na steeti Jigawa. Ọ bụ onyeisi ndị na-echekwa okporoụzọ  awara awara bụ Mazị Angus Ibezim, mere ka a mata nke a na 29 Julai bụ Satọdee 2017. O mere ka a mara na Tipa ahụ nke akara ya bụ; XY 744 GRK mebiri emebi n’akụkụ iro, nke mere ka onye nwe ya hapụ ya ebe ahụ. Ọ bụzi onye kwọ  J5 suru ya n’azụ, nke buteere ndị o bu ọnwụ erughi eru.
A dụọla ọdụ ka ndị ọkwọ  ụgbọ ala gbara ọsọ  na nwayọ  maka na eje alọ , bụ isi ije; tinyere na ọtụtụ ndị na-eme njem bụcha ndị nne na nna nwere ezinaụlọ  ha hapụrụ.
Mazi Ibezim mere ka amata na onye Tipa etinyeghi akara gosiri na ụgbọ ala ya mebiri emebi, ebe onye na-anya J5, na-agba ka onye na- eje Jegede, enweghikwanụ ọkụ n’ụgbọ ala ya, nke mere o jiri suo Tipa ahụ.
O mekwara ka a mara na a na-achọ  onye Tipa ahụ mbiaka mbiaka n’ihi na ọdara iwu gọọmenti.

Unigwe Chukwudalu, weteere ụnụ nke a. 

No comments