Lagos: a ga-atụ akwụkwọ ka ọ bụ na gaghị atụ- Mmiri ozuzo
Ndị steeti Lagos, anọrọla n’ọnọdụ aga-atụ, ka ọ na-agaghị atụ n’ihe gbasara akwụkwọ vootu e yibere ịtụ taa bụ 22 Julaị 2017. Nke a bụ n’ihi nnukwu mmiri ji ọnụ ụtụtụ were bido izo na Lagos. Ka o siri gbata kwụrụ ugbu a, ọtụtụ ndị mmadụ amaghị ka ha ga-esi gaa ebe a ga-atụ ya bụ akwụkwọ, n’ihi mmiri tojuru okporo ụzọ.Ọtụtụ mpaghara Lagos bụ ebe mmiri idei anaghị apụcha ma orughị opekata mpe, awa isii(6hrs). Ka o si dị ugbu a, onye ọ bụla gwuru ikpere abụọ n’ala na-arịọ Olisa ka mmiri ozuzo a kwụsị n’ ụtụtụ a, ka a mara na ihe ọ ga-adị ka e siri kpaa ya. Mmiri ozuzo bụ ihe a na-arịọ ka Chukwu weta, mana ọ bụghị ma n’ala Lagos.

No comments