Nke na-eme ugbua !!! E jidela onye uweojii gbaturu ọkwọ-ụgbọala tanka
Ndị Lagos steeti Police Command emeela ka a mara na aka akparala ya bụ onye uweojii nke gbaturu ọkwọ-ụgbọala tanka n’okporoụzọ awara awara Burma nke dị n’ Apapa. Ha mere ka a mara na aka akparakwuola ndị omekome iri na asatọ ndị soro bute ọgbaghara ahụ.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị Lagos state Command bụ ASP Olarinde Famous-Cole siri kwu, ha natara ozi mmekpa ahụ n’aka onyeisi ndị nche ụlọakụ dị n’akụkụ ebe ihe a mere, nke ha zakwara n’atụfughị oge. Dịka onye kpọrọ ha siri mee ka ha mata, ndị omekome a chọrọ ịmunye tanka a ọkụ, dịka onye uweojii na-echekwa ndị ụlọakụ ebe ha na-ebupụta ego, gbara onye na-anya ya egbe.
Ndị nche ndị ọzọ nọ n’okpuru Lagos state Command gbataara ha ọsọ enyemaka iji mee ka ihe na-ebe dajụọ. Commissioner na-ahụ maka ndị uweojii na Lagos sokwa wuchie ebe njinji a jiri.
A sị na ndi uweojii agbataghị ọsọ enyemaka ebe ihe a mere, ihe ka nte kaara ibakwuru nte n’ọnụ. A kaara imebi ihe karịa ka e mebiri.
Ndị iwe juru obi maka ihe mere gakwuru ndị ụlọakụ ka ha kpọpụta ya bụ onye uweojii bụ oji mgbọ eme ọgọ, ma ha jụrụ ajụ nke mere ndị a obi adịghị mma jiri chịrị wụnyere ndị ụlọakụ ndị ọzọ nọ na okporo ụzọ Wharf.
Ka nke a na-eme, e buuru ọkwọ-ụgbọala tanka a onye nke a sịrị na aha ya bụ Azeez, gaa ụlọọgwụ na-atụfughị oge ọbụla.
Ka osila dị, Famous-Cole mere ka a mata na ndị ụlọọgwụ kwuru na nwaamadị a achịkọtala ije ozi ya ngwa ngwa ha wuchiri ụlọọgwụ.
O mere ka a mata na ọ bụ naanị otu ọkwọ-ụgbọala ka a gbara egbe.
A kpọpụla onye uweojii a nyụrụ ihe siri n’ụlọikpe ebe a ka na enyocha mmadụ iri na asatọ ndị ọzọ.
Ndị uweojii gwara ndị mmadụ ka ha sepụ aka n’iji aka ha ama ndị mmadụ ikpe.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii mere ka amata na ihe agawakwala ka o kwesịrị n’ebe ahụ.

This is serious
ReplyDelete