Header Ads

Breaking News

Nke na-eme ugbua!!!... Ndi Road Safety anapụta nwoke chọrọ ịkwụ ụdọ

Ndị otu na-echekwa okporo ụzọ awara awara, a na-akpọ FRSC  napụtara otu nwoke chọrọ ịkwụgbu onwe ya n’ elu osisi. Ọ bụ onye ọkada hụrụ ya ka ọ na-aga ije dị aṅaa were metụrụ ndị otu FRSC nọ na Shagamu.
Ndi otu FRSC a, nke ọ bụ nwaamadi Igoche du ha, hapụrụ ihe niile ha na-eme were wụchie n’atụfughi oge ọbụla n’ọhịa dị n’ okporoụzọ awara awara si Lagos gaa Ibadan. Oge ndị otu FRSC ruru, ọnwụ ekwebela nwoke ahụ ọnụ, ma ha mere ngwa ngwa tọtuo ya ma nye ya ọgwụ “cardiopulmonary resuscitation (CPR) o wee nweta onwe ya. Oge ha na-enye ya ọgwụ a, ha metụụrụ ndị uwe ojii ha were wuchie ebe a na-enye nwoke a ọgwụ.


1 comment: