Header Ads

Breaking News

Oku ogbugba huru ndi mmadu ka ji ubochi Uka na Steeti Osun

O were bụrụ ka ọkụ ọgbụgba siri laa mmadụ iri na anọ n’iyi na steeti Osun ụbọchị ụka bụ 23 Julaị 2017. Ihe butere ọkụ ọgbụgba a bụ ihe mberede okporo ụzọ mere n’etiti onye tanka na ụgbọala(bus) bu ndi na eme njem.
Ndị hụrụ ihe mere kwuru na ndị ọkụ a gburu karịa bụ ụmụaka na ndị nne mmadụ nọ n’ụgbọala ahụ. Dịka ha siri kwu, ihe mberede a mere ebe 12 nke ehihie, n’ihu otu ebe a na-ere mmanụ ụgbọala na-eteghi aka n’ebe ụzọ jikọrọ ọnụ ndị mmadụ ma ama dị na Mayfair.
Ha mere ka a mata na ụgbọala a bụ nke na-ebu mmadụ iri na asatọ, bu ndị mmadụ si Ondo na-aga steeti Oyo, were danyere tanka bu gaasi, na-eme mgbagharị, ma binwuru ọkụ ngwa ngwa o suru tanka ahụ, nke hụrụ ọtụtụ mmadụ ka ji. Otu onye mere ka a mata na ihe mere ọkụ ahụ jiri mebie ihe ebe ọ dị ukwu bụ na enyemaka abịaghị ngwa ngwa. Ọ bụ naanị mmadụ abụọ ka a napụtara n’ọkụ ọgbụgba a dị egwu, ndị e bugara ụlọọgwụ na ndụ.
Onyeisi ndị na-ahụ maka nchekwa okporoụzọ (FRSC) mere ka a mata na ndị nwụrụ n’ihe mberede a karịrị mmadụ iri na anọ.

E mere ka amata na ahụghịkwanụ ọkwọ ụgbọala tanka, n’ihi na ọ naara Chiọma Ajụnwa ngwa ngwa nke a mere.

No comments