Onweghị nkewa dị n’etiti anyị na ndị IPOB- Ọhanaeze Ndigbo
Ndị otu jikọrọ omenala Igbo bụ Ọhanaeze ndị Igbo ekwuola ka ọnọdụ ha na ndị IPOB siri kwụrụ.
N’okwu nke odeakwụkwọ, Prince Uche Achi-okpaga, kwuchiteere Ọhanaeze Ndigbo nọ na mba ụwa gburugburu na’Abakiliki, ihe dị n’etiti anyị na ndị IPOB dị ka ihe dị n’etiti nna na nnwa.
Ọ sịrị na onweghi ihe a ga-ekwu, ga-emegide ndị IPOB, n’ihi na ihe jikọrọ ha jisi ha ike.
Okwu ya dọrọ ndị asịrị aka na ntị, ka ha ghara ịkpụtọsịzi aha ndị Ọhanaeze Ndigbo n’ihi na e nweghi nkewa ọbụla dị na etiti ha.
Ọ sịrị na onweghi ihe ọ sọrọ ndị mmadụ mee, maọbụ kwuo, nke ga-ebute ọgbaghara n’etiti ha na ndị IPOB.

No comments