Goomenti etiti ayoo Dangote ka o mee osooso n' Ulo Nsicha mmanu ugboala o na-aru na Lekki
Gọọmenti etiti ayọọla onyeisi ndị Dangote Groups bụ Alhaji Aliko Dangote, ka o mee ngwa ngwa ịrụcha ebe a na-esicha mmanụ ụgbọala ọ na-arụ na Lekki, Lagos. O mere ka ndị Dangote mara na ọ bụ ha ka o chekwubere iji mezu nkwa e kwere ụmụafọ Naijiria n’ihe gbasatara imechi isi esi ebubata mmanụ ụgbọala e ji eme ihe na Naijiria na 2019.
Minista na-ahụ maka Mmanụ na ihe nrita ala bụ Dkt. Ibe Kachikwu, onye gara hụ ụlọ nnụcha mmanụ ụgbọala a na-arụ ụnyaahụ mere ka amata na gọọmentị etiti dị njikere ime ka aka ha ha, iji hụ na ụkwa a a na-apị, na apịchapụtara ya mkpụrụ. Ọ kọwara na obi juputara n’aṅụrị na mbọ ụmụafọ Naijiria na-agba iji hụ na mmiri erighi obodo a bụ Naijiria n’ihe gbasatara mmepe obodo, ịrụ ụlọọrụ, nakwazi inye ndị mmadụ ọrụ.
O kwuru na ọ gwala ụmụafọ Naijiria na a ga-akwụsị ibubata mmanụ ụgbọala ebubata na Naijiria tupu e ruo afọ 2019, na ọ ga-agba mbọ ịhụ na okwu ya mezuru ka o siri kwuo ya.
Onyeisi ndị Dangote mekwaranụ ka a mara na Chukwu soro kwuo, na ọrụ ha ebe ahụ ga-ebi tupu oge Minista kwuru eruo. N’okwu nke ya, ọ sịrị; “ amaara m na Minista ga-enyere anyị aka ebe o kwesịrị, ịhụ na anyị mezuru nkwa anyị, mgbe o kwesrịrị.
O mekwara ka a mata na ụlọ nsicha mmanụ ụgbọala ha na-arụ, ga na-emepụta mmanụ ruru ọnụọgụgụ barel puku nari isii na puku iri ise(650,000)kwa ụbọchị.

No comments