Mahadum Port Harcourt achuo Umuakwukwo isii, nye ndi nkuzi ntaramahuhu
Mahadum Port Harcourt chụrụ ụmụakụkwọ isii maka iwu dị iche iche ha dachara. Akwụkwọ mgbasaozi ndị mahadum a batara anyị aka gosiri na ihe mere e jiri chụọ ha bụ ihe gbasatara mpụ ule na inye aka azụ.
E mekwara ka anyị mara na achụkwara nwata nwoke na-eme ihe ọmụmụ postgraduate ya, maka inye akaazụ ka e were kwụsị ahịa mbugharị n’ụlọakwụkwọ. E mekwara ka anyị mara na-enyekwaziri ndị nkuzi asaa, ndị a sịrị na ha so were kwatuo ụlọ a ka na-arụ arụ na Mahadum a. Ka o siri gbata kwụrụ ugbu a, ndị nkuzi asaa, anaghizi eri ụgwọ ọnwa zuru ezu, ruo mgbe oge ntaramahụhụ ha ga-ebi. A dụọla ndị mmadụ, ọkacha ụmụakwụkwọ ọdụ, ka ha sepụ aka n’ihe ọjọọ dịgasị iche uche.

No comments